-
Joshụa 20:4, 5Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
-
-
4 Onye ahụ gburu mmadụ ga-agbaga n’otu n’ime obodo ndị ahụ,+ guzoro n’ebe e si abanye n’ọnụ ụzọ ámá obodo ahụ+ gwa ndị okenye obodo ahụ otú ihe si mee. Ha ga-anabatakwa ya n’obodo ahụ ma nye ya ebe ọ ga-ebi. Ya na ha ga-ebikwa. 5 Ọ bụrụ na onye na-abọrọ onye ahụ nwụrụ anwụ ọbọ achụrụ ya bịa, ha ekwesịghị inyefe onye ahụ gburu mmadụ n’aka ya, n’ihi na o gburu mmadụ ibe ya n’ọghọm,* ọ bụghị na ọ kpọrọ ya asị.+
-