-
Ọnụ Ọgụgụ 16:39, 40Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
-
-
39 Elieza onye nchụàjà weere ihe ndị ahụ e ji amụ insens, bụ́ ndị e ji ọla kọpa mee, ya bụ, ihe ndị ahụ ọkụ regburu wetara, ma kụọ ha ka ha dị mbadamba ka e jiri ha machie ebe ịchụàjà, 40 otú Jehova si n’ọnụ Mosis gwa ya. Ọ bụ ihe na-echetara ndị Izrel na onye na-abụghị onye nchụàjà,* onye na-abụghịkwa nwa Erọn, agaghị abịa nso ka ọ mụọ insens n’ihu Jehova+ nakwa na onye ọ bụla ekwesịghị ịdị ka Kora na ndị kwadoro ya.+
-