9 Ma Onan ma na nwa ọ ga-amụta agaghị abụ nke ya.+ N’ihi ya, mgbe ya na nwunye nwanne ya na-enwe mmekọahụ, ọ na-anyụfusị ọbara ọcha ya n’ala ka o wee ghara ịmụtara nwanne ya nwoke nwa.+
10 Ana m agbarakwa Rut nwaanyị Moab, bụ́ nwunye Malọn, ka ọ bụrụ nwunye m. Ihe a ga-eme ka ala nwoke ahụ nwụrụ anwụ ghara ịgara ndị ọzọ,+ meekwa ka ụmụnne ya na ndị obodo a ghara ichefu aha ya. Unu bụ ndị akaebe taa.”+