11 O kwekwara Chineke nkwa, sị: “Jehova nke ụsụụ ndị agha, ọ bụrụ na ị hụ ahụ́ a na-emekpa mụnwa bụ́ ohu gị ma cheta m, gharakwa ichefu ohu gị ma nye ohu gị nwa nwoke,+ m ga-enye gị ya, Jehova, ka o jiri ndụ ya niile jeere gị ozi. Agụba agaghịkwa emetụ ya n’isi.”+