Diuterọnọmi 16:16 Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ 16 “Ugboro atọ n’afọ ka ụmụ nwoke unu niile ga-abịa n’ihu Jehova bụ́ Chineke unu n’ebe ọ ga-ahọrọ: n’Ememme Achịcha Na-ekoghị Eko,+ n’Ememme Izu,+ nakwa n’Ememme Ụlọ Ndò.+ E nweghị onye n’ime ha ga-agba aka bịa n’ihu Jehova. 1 Samuel 2:18, 19 Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ 18 Samuel na-eyi ákwà efọd e ji linin kwaa+ ejere Jehova ozi,+ n’agbanyeghị na ọ bụ nwata. 19 Nne ya na-akwakwara ya obere uwe elu na-enweghị aka. Ọ na-achịgakwara ya uwe ahụ kwa afọ ma ya na di ya gaa ịchụ àjà a na-achụ n’afọ ọ bụla.+
16 “Ugboro atọ n’afọ ka ụmụ nwoke unu niile ga-abịa n’ihu Jehova bụ́ Chineke unu n’ebe ọ ga-ahọrọ: n’Ememme Achịcha Na-ekoghị Eko,+ n’Ememme Izu,+ nakwa n’Ememme Ụlọ Ndò.+ E nweghị onye n’ime ha ga-agba aka bịa n’ihu Jehova.
18 Samuel na-eyi ákwà efọd e ji linin kwaa+ ejere Jehova ozi,+ n’agbanyeghị na ọ bụ nwata. 19 Nne ya na-akwakwara ya obere uwe elu na-enweghị aka. Ọ na-achịgakwara ya uwe ahụ kwa afọ ma ya na di ya gaa ịchụ àjà a na-achụ n’afọ ọ bụla.+