-
1 Samuel 25:14-16Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
-
-
14 Ka ihe a na-eme, otu n’ime ndị na-ejere Nebal ozi kọọrọ Abigel, nwunye Nebal, sị: “Devid si n’ala ịkpa zite ndị ozi ka ha gọzie nna anyị ukwu, ma ọ kparịrị ha.+ 15 Ụmụ nwoke ndị ahụ mesoro anyị otú dị mma. O nweghị mgbe ha nyere anyị nsogbu. O nweghịkwa otu mkpụrụ ihe funahụrụ anyị n’oge niile anyị na ha nọ n’ọhịa.+ 16 Ha dị ka mgbidi gbara anyị gburugburu ma n’ehihie ma n’abalị, n’oge niile anyị na ha nọ, ka anyị na-azụ ewu na atụrụ anyị.
-