10 Ụmụ nwoke abụọ ahụ wee wepụta aka ha sebata Lọt n’ime ụlọ, ha mechikwara ụzọ. 11 Ma ha mere ka ụmụ nwoke ahụ nọ n’ọnụ ụzọ ụlọ ahụ kpuo ìsì, malite n’onye kacha nta n’ime ha ruo n’onye kacha ukwuu, nke mere na ike gwụrụ ha ebe ha nọ na-achọ ọnụ ụzọ ahụ.