8 Jehova gwakwara Erọn, sị: “M meela gị onye na-ahụ maka onyinye ndị a na-enye m.+ Enyela m gị na ụmụ gị ndị nwoke ụfọdụ n’ime ihe niile dị nsọ ndị Izrel na-enye n’onyinye ka ha bụrụ òkè a ga na-enye unu mgbe niile.+
11 Ihe ndị a ga-abụkwa nke gị: onyinye ndị ha na-enye+ nakwa àjà niile a na-efegharị efegharị+ ndị Izrel na-eweta. Ewerela m ha nye gị na ụmụ gị ndị nwoke na ụmụ gị ndị nwaanyị ka ha bụrụ òkè unu mgbe niile.+ Onye ọ bụla dị ọcha nọ n’ụlọ gị nwere ike iri ya.+
13 Ọ̀ bụ na unu amaghị na ndị na-arụ ọrụ dị nsọ na-eri ihe ndị dị n’ụlọ nsọ, nakwa na ndị na-arụ ọrụ mgbe niile n’ebe a na-achụ àjà na-eketa ihe ụfọdụ e ji chụọ àjà?+