19 Mịkaya asị: “Nụrụnụ ihe Jehova chọrọ ka m gwa unu: M hụrụ ka Jehova nọ n’ocheeze ya+ nakwa ka ndị mmụọ ozi niile guzo n’aka nri ya nakwa n’aka ekpe ya.+
13 “Anọ m na-ele ihe na-eme n’ọhụụ m nọ na-ahụ n’abalị, ma lee, onye yiri nwa nke mmadụ+ nọ na-abịa n’ígwé ojii nke eluigwe. E kwere ka ọ banye n’ebe Onye Ochie ahụ nọ.+ E wee kpọrọ ya bịa nso n’ihu Onye ahụ.