25N’abalị iri n’ọnwa iri, n’afọ nke itoolu n’ọchịchị Zedekaya, Nebukadneza+ eze Babịlọn na ndị agha ya niile bịara ịlụso Jeruselem agha.+ Ọ mara ụlọikwuu ọ ga-anọ lụso ya agha, rụọkwa mgbidi gburugburu ya ka o nwee ike nọchibido ya.+
32Mgbe Hezekaya mechara ihe ndị a otú e kwesịrị isi eme ha,+ Senakerib eze Asiria batara Juda n’ike, nọchibidokwa obodo ndị a rụsiri ike na ya. O bukwa n’obi itipu mgbidi ha bata ma weghara ha.+