-
Ọpụpụ 18:21, 22Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
-
-
21 Ma, ị ga-esi ná ndị Izrel họpụta ụmụ nwoke ruru eru+ bụ́ ndị na-atụ egwu Chineke, ndị a ga-atụkwasịli obi, ndị kpọrọ uru e ji aghụghọ erite asị.+ Ị ga-emekwa ha ndị isi otu puku otu puku mmadụ, ndị isi otu narị otu narị mmadụ, ndị isi mmadụ iri ise mmadụ iri ise, na ndị isi mmadụ iri mmadụ iri.+ 22 Ha ga na-ekpe ndị Izrel ikpe mgbe ọ bụla e nwere ikpe, ha ga na-ewetakwara gị ikpe ọ bụla siri ike.+ Ma ha ga-ekpebi ikpe ọ bụla na-esighị ike. Ị ga-eme ka ihe dịkwuoro gị mfe ma ọ bụrụ na i kwe ka ha soro gị na-arụ ọrụ a.+
-