-
Nehemaya 9:17Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
-
-
17 Ha ekweghị ege ntị,+ ha echetaghịkwa ọrụ ebube gị ndị ị rụụrụ ha. Kama, ha mere isi ike* ma họpụta onyeisi ka ha wee laghachi n’Ijipt gaa gbawakwa ohu.+ Ma ị bụ Chineke dị njikere ịgbaghara mmehie,* onye nwere ọmịiko* ma na-eme ebere, onye na-anaghị ewe iwe ọsọ ọsọ na onye ịhụnanya ya* dị ukwuu.+ Ị hapụghịkwa ha.+
-
-
Jona 4:2Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
-
-
2 N’ihi ya, o kpere ekpere sị Jehova: “Chaị, Jehova, ọ̀ bụ na ọ bụghị ihe a nọ na-enye m nsogbu n’obi mgbe m nọ n’ala m? Ọ bụ ya mere m jibu chọọ ịgbaga Tashish+ n’ihi na ama m na ị bụ Chineke nwere ọmịiko* ma na-eme ebere, onye na-anaghị ewe iwe ọsọ ọsọ, onye ịhụnanya ya* dị ukwuu,+ onye ọdachi na-ewutekwa.
-