Abụ Ọma 40:5 Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ 5 Jehova bụ́ Chineke m,Ihe ndị i merela karịrị akarị,Ya bụ, ọrụ ndị dị ebube ị na-arụ na ihe ndị ị na-echere anyị.+ E nweghị onye a ga-eji tụnyere gị.+ Ọ bụrụ na mụ asị ka m gbalịa kwuwe banyere ha,Ha dị nnọọ ọtụtụ nke na enweghị m ike ikwucha ha.+ Abụ Ọma 145:4 Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ 4 Ọgbọ niile ga-aja ọrụ gị niile mma. Ha ga-akọ banyere nnukwu ọrụ ndị ị na-arụ.+ Ekliziastis 3:11 Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ 11 O mere ka ihe ọ bụla maa mma n’oge kwesịrị ekwesị.+ O medịrị ka ịdị ndụ ebighị ebi na-agụ ndị mmadụ agụụ.* Ma ha emekataghị chọpụta ọrụ ezi Chineke rụrụ malite n’isi ruo ná ngwụcha. Mkpughe 15:3 Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ 3 Ha nọkwa na-abụ abụ Mosis,+ ohu Chineke, na-abụkwa abụ Nwa Atụrụ ahụ,+ sị: “Jehova* Chineke, Onye Pụrụ Ime Ihe Niile,+ ọrụ gị dị ukwuu, dịkwa ebube.+ Eze mgbe ebighị ebi,+ ụzọ gị ziri ezi, ị na-ekwukwa eziokwu.+
5 Jehova bụ́ Chineke m,Ihe ndị i merela karịrị akarị,Ya bụ, ọrụ ndị dị ebube ị na-arụ na ihe ndị ị na-echere anyị.+ E nweghị onye a ga-eji tụnyere gị.+ Ọ bụrụ na mụ asị ka m gbalịa kwuwe banyere ha,Ha dị nnọọ ọtụtụ nke na enweghị m ike ikwucha ha.+
11 O mere ka ihe ọ bụla maa mma n’oge kwesịrị ekwesị.+ O medịrị ka ịdị ndụ ebighị ebi na-agụ ndị mmadụ agụụ.* Ma ha emekataghị chọpụta ọrụ ezi Chineke rụrụ malite n’isi ruo ná ngwụcha.
3 Ha nọkwa na-abụ abụ Mosis,+ ohu Chineke, na-abụkwa abụ Nwa Atụrụ ahụ,+ sị: “Jehova* Chineke, Onye Pụrụ Ime Ihe Niile,+ ọrụ gị dị ukwuu, dịkwa ebube.+ Eze mgbe ebighị ebi,+ ụzọ gị ziri ezi, ị na-ekwukwa eziokwu.+