Abụ Ọma 71:18 Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ 18 Chineke, biko, m megodị agadi gbaa isi awọ́, ahapụla m.+ Biko, ka m kọọrọ ọgbọ na-abịa abịa banyere ike* gị,Kọọkwara ndị niile a ka ga-amụ banyere ihe ndị dị ukwuu ị na-eme.+ Ilu 16:31 Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ 31 Isi awọ́ bụ okpueze mara mma*+Ma ọ bụrụ na onye nwere ya na-ebi ndụ dị mma.+ Aịzaya 40:31 Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ 31 Ma, ndị nwere olileanya na Jehova ga-enyere ha aka ga-enwetaghachi ike. Ha ga-efeli elu ka à ga-asị na ha nwere nku ka ugo.+ Ha ga-agba ọsọ, ma ike agaghị agwụ ha. Ha ga-eje ije, ma ha agaghị ada mbà.”+ Aịzaya 46:4 Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ 4 Unu megodị agadi, agaghị m agbanwe.+ Isi unu chagodị awọ́, m ka ga na-elekọta unu. Dị ka m na-eme kemgbe, m ga na-enyere unu aka, na-elekọta unu, na-anapụtakwa unu.+
18 Chineke, biko, m megodị agadi gbaa isi awọ́, ahapụla m.+ Biko, ka m kọọrọ ọgbọ na-abịa abịa banyere ike* gị,Kọọkwara ndị niile a ka ga-amụ banyere ihe ndị dị ukwuu ị na-eme.+
31 Ma, ndị nwere olileanya na Jehova ga-enyere ha aka ga-enwetaghachi ike. Ha ga-efeli elu ka à ga-asị na ha nwere nku ka ugo.+ Ha ga-agba ọsọ, ma ike agaghị agwụ ha. Ha ga-eje ije, ma ha agaghị ada mbà.”+
4 Unu megodị agadi, agaghị m agbanwe.+ Isi unu chagodị awọ́, m ka ga na-elekọta unu. Dị ka m na-eme kemgbe, m ga na-enyere unu aka, na-elekọta unu, na-anapụtakwa unu.+