Abụ Ọma 19:7 Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ 7 Iwu Jehova zuru okè.+ Ọ na-eme ka mmadụ nweghachi ume.*+ Ihe Jehova na-echetara ndị ya bụ ihe e kwesịrị ịtụkwasị obi.+ Ọ na-eme ka onye na-amaghị ihe mara ihe.+ Abụ Ọma 40:8 Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ 8 Chineke m, ime uche gị na-atọ m ụtọ,+Iwu gị dịkwa n’ime ime obi m.+ Abụ Ọma 112:1 Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ 112 Toonụ Jaa!*+ א [Alef] Onye na-atụ egwu Jehova na-enwe obi ụtọ,+ב [Bet]Ya bụ, onye iwu ya na-amasị nke ukwuu.+ Matiu 5:3 Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ 3 “Ndị ma na ọ bụ Chineke kwesịrị ịna-eduzi ha* na-enwe obi ụtọ,+ n’ihi na Alaeze eluigwe bụ nke ha. Ndị Rom 7:22 Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ 22 N’ime obi m, iwu Chineke na-amasị m.+ Jems 1:25 Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ 25 Ma onye na-enyocha iwu Chineke, nke zuru okè,+ nke na-eme ka mmadụ nwere onwe ya, onye na-emekwa ihe o kwuru, abụghị onye na-echefu ihe ọ nụrụ. Ọ bụ onye na-arụ ọrụ Chineke sị ka a rụọ. Ọ ga-enwekwa obi ụtọ ma ọ na-arụ ya.+
7 Iwu Jehova zuru okè.+ Ọ na-eme ka mmadụ nweghachi ume.*+ Ihe Jehova na-echetara ndị ya bụ ihe e kwesịrị ịtụkwasị obi.+ Ọ na-eme ka onye na-amaghị ihe mara ihe.+
112 Toonụ Jaa!*+ א [Alef] Onye na-atụ egwu Jehova na-enwe obi ụtọ,+ב [Bet]Ya bụ, onye iwu ya na-amasị nke ukwuu.+
25 Ma onye na-enyocha iwu Chineke, nke zuru okè,+ nke na-eme ka mmadụ nwere onwe ya, onye na-emekwa ihe o kwuru, abụghị onye na-echefu ihe ọ nụrụ. Ọ bụ onye na-arụ ọrụ Chineke sị ka a rụọ. Ọ ga-enwekwa obi ụtọ ma ọ na-arụ ya.+