5 Ugbu a, ọ bụrụ na unu ga-erube isi n’ihe niile m kwuru ma ghara imebi ọgbụgba ndụ mụ na unu ga-agba, unu ga-abụrụ m ndị pụrụ iche n’ime ndị niile ọzọ,+ n’ihi na ọ bụ m nwe ụwa niile.+
9 O dokwara unu anya na Jehova bụ́ Chineke unu bụ ezi Chineke, Chineke e kwesịrị ịtụkwasị obi, onye na-anaghị emebi ọgbụgba ndụ ya na ndị hụrụ ya n’anya na ndị na-edebe iwu ya gbara, na-ahụkwa ha n’anya* ruo otu puku ọgbọ.+