1 Ndị Eze 3:9 Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ 9 Biko, nyere ohu gị aka ka o jiri obi ya niile na-erubere gị isi, ka o nwee ike ịna-ekpe ndị gị ikpe,+ na-amata ihe dị iche n’ihe ọma na ihe ọjọọ,+ n’ihi na ònye ga-ekpeli ndị gị a dị ọtụtụ* ikpe ma ọ bụrụ na i nyereghị ya aka?” Abụ Ọma 94:10 Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ 10 Ọ̀ bụ na Onye na-adọ mba dị iche iche aka ná ntị enweghị ike ịbara unu mba?+ Ọ bụ ya na-akụziri ndị mmadụ ihe ka ha mara ihe.+ Daniel 2:21 Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ 21 Ọ na-agbanwe oge na mgbe ihe ga-eme.+ Ọ na-ewepụ ndị eze, na-emekwa ka ndị eze malite ịchị.+ Ọ na-enye ndị ma ihe amamihe, na-emekwa ka ndị nwere ọgụgụ isi na-aghọta ihe.+ Ndị Filipaị 1:9 Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ 9 Ihe m na-ekpekwa n’ekpere bụ ka ịhụnanya unu na-abakwu ụba,+ ka unu na-amatakwu uche Chineke nke ọma+ ma na-aghọtacha uche ya;+
9 Biko, nyere ohu gị aka ka o jiri obi ya niile na-erubere gị isi, ka o nwee ike ịna-ekpe ndị gị ikpe,+ na-amata ihe dị iche n’ihe ọma na ihe ọjọọ,+ n’ihi na ònye ga-ekpeli ndị gị a dị ọtụtụ* ikpe ma ọ bụrụ na i nyereghị ya aka?”
10 Ọ̀ bụ na Onye na-adọ mba dị iche iche aka ná ntị enweghị ike ịbara unu mba?+ Ọ bụ ya na-akụziri ndị mmadụ ihe ka ha mara ihe.+
21 Ọ na-agbanwe oge na mgbe ihe ga-eme.+ Ọ na-ewepụ ndị eze, na-emekwa ka ndị eze malite ịchị.+ Ọ na-enye ndị ma ihe amamihe, na-emekwa ka ndị nwere ọgụgụ isi na-aghọta ihe.+
9 Ihe m na-ekpekwa n’ekpere bụ ka ịhụnanya unu na-abakwu ụba,+ ka unu na-amatakwu uche Chineke nke ọma+ ma na-aghọtacha uche ya;+