-
Ndị Hibru 12:9-11Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
-
-
9 Ndị nna mụrụ anyị na-adị adọ anyị aka ná ntị, anyị na-akwanyekwara ha ùgwù. Ọ̀ bụ na anyị ekwesịghị ido onwe anyị n’okpuru Nna nke ji mmụọ nsọ ya họpụta anyị ka anyị wee dị ndụ?+ 10 N’ihi na ha na-adọ anyị aka ná ntị ruo obere oge otú ha chere dị mma, ma Chineke na-adọ anyị aka ná ntị ga-abara anyị uru ka anyị wee dị nsọ ka ya.+ 11 N’eziokwu, e nweghị ịdọ aka ná ntị na-eme mmadụ obi ụtọ mgbe a na-adọ ya onye ahụ, kama ọ na-ewute ewute. Ma e mechaa, ọ na-abara ndị e ji ya zụọ ezigbo uru. Ha ga na-eme ezi omume, obi eruokwa ha ala.
-