25 N’oge ahụ, Jizọs kwuru, sị: “Nna, Onyenwe eluigwe na ụwa, ana m eto gị n’ihu ọha n’ihi na i zochiiri ndị ma ihe na ndị ọkachamara ihe ndị a ma mee ka ụmụaka mara ha.+
46 Mgbe ụbọchị atọ gachara, ha chọtara ya n’ụlọ nsọ ebe ya na ndị nkụzi nọ, ya anọrọ ọdụ, na-ege ha ntị, na-ajụkwa ha ajụjụ. 47 Ma otú o si aghọta ihe na ihe ọ na-aza ha juru ndị niile na-ege ya ntị anya.+