20 N’ihi na e leruo otú e si kee ụwa anya, a na-ahụ àgwà ya ndị a na-anaghị ahụ anya. Ihe ndị o kere na-eme ka a ghọta ụdị onye ọ bụ.+ Ha na-eme ka a mata na ike ya na-adịru ebighị ebi+ nakwa na ọ bụ Chineke.+ Ndị na-eleghara ihe ndị a anya enweghị ihe mere ha ga-eji kwuo na Chineke adịghị.