13 Anụkwara m ka ihe niile e kere eke ndị dị n’eluigwe na n’ụwa na n’okpuru ala+ na n’oké osimiri, na ihe niile dị n’ime ha, na-asị: “Ka a na-asọpụrụ Chineke, onye dị ike, nke nọ ọdụ n’ocheeze ahụ,+ na Nwa Atụrụ ahụ,+ onye dị ike, ka a na-ajakwa ha mma+ ma na-eto ha ruo mgbe niile ebighị ebi.”+