9 “Solomọn nwa m, mara Chineke nna gị na-efe, jiri obi gị niile+ na-ejere ya ozi, na-aṅụrịkwa ọṅụ n’ozi ị na-ejere ya, n’ihi na Jehova na-enyocha obi niile,+ na-amatakwa ihe niile dị mmadụ n’obi.+ Ị chọọ ya, ị ga-achọta ya.+ Ma, ị hapụ ya, ọ ga-ajụ gị ruo mgbe ebighị ebi.+
23 M ga-emekwa ka ụmụ ya rịawa ọrịa ga-emecha gbuo ha, ka ọgbakọ niile wee mara na ọ bụ m na-enyocha obi na ihe dị n’ala ala obi.* M ga-akwụkwa onye ọ bụla n’ime unu ụgwọ otú o si kpaa àgwà.+