17 Ọ bụrụ na unu asị n’obi unu, ‘Ọ bụ ike anyị na ọkpụkpụ aka anyị ka anyị ji kpatara onwe anyị akụ̀ ndị a,’+ 18 chetanụ na ọ bụ Jehova bụ́ Chineke unu na-enye unu ike unu ji akpata akụ̀,+ ka o wee mezuo ọgbụgba ndụ ya na nna nna unu hà gbara, otú ọ na-eme taa.+