21 Zọpụta m n’ọnụ ọdụm,+ zọpụtakwa m ka atụ́ ghara iji mpi ya sọgbuo m.
Za m ma zọpụta m.
22 M ga-akọsara ụmụnna m aha gị.+
M ga-eto gị n’ime ọgbakọ.+
23 Unu ndị na-atụ egwu Jehova, toonụ ya.
Unu niile bụ́ ụmụ Jekọb, jaanụ ya mma.+
Tụọnụ egwu ya, unu niile bụ́ ụmụ Izrel.