11 Izrel nna ha wee sị ha: “Ọ bụrụ na ọ ga-esorịrị unu, meenụ ihe a: Werenụ ihe ndị a kacha mma ala a mepụtara tinye n’akpa unu, burukwanụ ha bugara nwoke ahụ ka ọ bụrụ onyinye unu ga-enye ya:+ obere mmanụ balsam,+ obere mmanụ aṅụ, eso labdanọm, azụ osisi,+ mkpụrụ pistashio, na almọnd.