7 “Ọ bụrụ na otu n’ime ụmụnne unu adaa ogbenye n’otu n’ime obodo unu, n’ala Jehova bụ́ Chineke unu na-enye unu, unu akpọchila obi unu ma ọ bụ jụ inyere nwanne unu dara ogbenye aka.+8 Unu ga-emesapụrụ ya aka+ ma gbazinye ya ihe ọ bụla na-akpa ya.
10 N’ihi na Chineke abụghị onye ajọ omume. Ọ gaghị echefu ọrụ unu na otú unu si gosi na unu ji aha ya kpọrọ ihe*+ n’ihi na unu jeere ndị nsọ ozi ma ka na-ejere ha ozi.