-
2 Samuel 12:9-11Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
-
-
9 Gịnị mere i ji leda Jehova* anya, gaa mee ihe ọ sị emela? I gbuola Yuraya onye Het.+ I ji mma agha ndị Amọn gbuo ya,+ kpọrọkwa nwunye ya.+ 10 Ebe ọ bụ na i ledara m anya gaa kpọrọ nwunye Yuraya onye Het lụwa, mma agha agaghị apụ apụ mgbe ọ bụla n’ezinụlọ gị.’*+ 11 Jehova kwuru, sị: ‘M ga-eme ka ọdachi dakwasị gị. N’ụlọ gị ka ọ ga-esi dakwasị gị.+ M ga-anọkwa n’ihu gị kpọrọ ndị nwunye gị kpọnye nwoke ọzọ.+ Ọ ga-edinakwa ha n’ehihie ọcha.+
-