-
Ọnụ Ọgụgụ 27:12-14Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
-
-
12 Jehova gwaziri Mosis, sị: “Gbagoo n’ugwu a dị n’Abarim+ ka ị hụ ala m ga-enye ndị Izrel.+ 13 Ị hụchaa ya, ị ga-anwụ otú Erọn nwanne gị nwụrụ,+ e liekwa gị otú e liri ndị nna nna gị,+ 14 n’ihi na mgbe nzukọ a sesara m okwu n’ala ịkpa Zin, unu nupụrụ isi n’iwu m nyere unu, ghara ido m nsọ n’ihu ha mgbe m nyere ha mmiri.+ Ihe a mere na mmiri Meriba+ nke dị na Kedesh,+ n’ala ịkpa Zin.”+
-