23 Mgbe Abigel hụrụ Devid, o si n’elu jakị rịtuo ozugbo, kpudo ihu n’ala n’ihu Devid, kpọọkwa isiala. 24 O gbukwara ikpere n’ala n’ihu ya, sị: “Onyenwe m, were ya na ọ bụ m mere gị ihe ọjọọ ahụ. O nwere ihe ohu gị nwaanyị chọrọ ịgwa gị. Getụnụ ohu gị nwaanyị ntị.