5 Kwụsị ile m anya,+
N’ihi na ọ na-eme ka ahụ́ ghara iru m ala.
Ntutu isi gị dị ka ìgwè ewu
Ndị si na Gilied na-agbadata.+
6 Ezé gị dị ọcha ka ìgwè atụrụ
Ndị si n’ebe a sara ha ahụ́ na-apụta.
Ha niile na-amụ ejima ejima.
E nwebeghị nke ọ bụla n’ime ha nwa ya nwụrụ.
7 Ntì gị abụọ i kpuchiri ákwà
Dị ka pomigranet a pịwara abụọ.