4 “M ga-esetị aka m mee Juda
Na ndị niile bi na Jeruselem ihe.
M ga-ekpochapụkwa ndị fọdụrụ ná ndị na-efe Bel ebe a,+
Hichapụkwa aha ndị nchụàjà chi ala ọzọ, ha na ndị nchụàjà ndị ọzọ na-ekpere arụsị.+
5 M ga-ekpochapụkwa ndị na-anọ n’elu ụlọ akpọrọ ihe ndị dị n’eluigwe isiala,+
Nakwa ndị na-akpọrọ Jehova isiala, na-ekwe ya nkwa na ha agaghị ahapụ ya,+
Ma, ha ana-ekwekwa Malkam nkwa na ha agaghị ahapụ ya.+