2 Ha na-achọ ka m na-eduzi ha kwa ụbọchị.
Ha na-ekwukwa na ịmara ụzọ m dị ha mma,
Ka à ga-asị na ha bụ mba nke na-eme ezi omume,
Nke na-ahapụghịkwa iwu Chineke ha.+
Ha na-arịọ m ka m kpeere ha ikpe ziri ezi,
Ka à ga-asị na ịbịaru Chineke nso dị ha mma.+