Aịzaya
58 Ọ gwara m, sị: “Tie ezigbo mkpu. Emechila ọnụ.
Mee ka olu gị dasie ụda ike dị ka opi.
Gwa ndị m otú ha si nupụ isi,+
Gwakwa ezinụlọ Jekọb mmehie ha.
2 Ha na-achọ ka m na-eduzi ha kwa ụbọchị.
Ha na-ekwukwa na ịmara ụzọ m dị ha mma,
Ka à ga-asị na ha bụ mba nke na-eme ezi omume,
Nke na-ahapụghịkwa iwu Chineke ha.+
Ha na-arịọ m ka m kpeere ha ikpe ziri ezi,
Ka à ga-asị na ịbịaru Chineke nso dị ha mma.+
3 Ma ugbu a, unu na-asị: ‘Gịnị mere na ị hụghị anyị mgbe anyị na-ebu ọnụ?+
Gịnịkwa mere na ị maghị mgbe anyị na-emekpa onwe* anyị ahụ́?’+
Ihe m ga-aza unu bụ, ọ bụ maka na unu na-achụ ihe ga-abara naanị onwe unu uru n’ụbọchị unu na-ebu ọnụ.
Unu na-emegbukwa ndị na-arụrụ unu ọrụ.+
4 Ọnụ unu na-ebu na-akpata esemokwu na ọgụ,
Unu na-akụkwa ọkpọ ka ndị obi fere azụ.
Ọ bụrụ na unu ana-ebu ọnụ otú a unu na-ebu taa, a gaghị anụ olu unu n’eluigwe.
5 Ụbọchị unu na-ebu ọnụ dị ka ụbọchị mmadụ na-emekpa onwe* ya ahụ́,
Ụbọchị mmadụ na-ehulata isi ya dị ka ahịhịa amị,
Gbasaa ákwà iru uju, kposaakwa ntụ ka o dinara na ya.
Ọ̀ bụ otú a ka m chọrọ ka unu si na-ebu ọnụ?
Ọ̀ bụ ụdị ibu ọnụ a na ụdị ụbọchị a ka unu na-asị dị Jehova mma?
6 Mbanụ. Ụdị ibu ọnụ m chọrọ bụ:
Ka unu tọpụ agbụ e ji obi ọjọọ kee,
Ka unu tọpụ eriri e ji kegide osisi yok,+
Ka unu hapụ ndị a na-echi ọnụ n’ala ka ha nwere onwe ha,+
Nakwa ka unu gbajie osisi yok niile.
7 M chọkwara ka unu nye ndị agụụ na-agụ ihe oriri,+
Ka unu kpọbatakwa ndị ogbenye na ndị na-enweghị ebe ha ga-ebi n’ụlọ unu.
Ọ bụrụ na unu ahụ ndị na-enweghị uwe, m chọrọ ka unu yiwe ha uwe,+
Ka unu gharakwa ịgbakụta ndị ikwu unu azụ.
8 Ọ bụrụ na unu ana-eme ihe ndị a, ìhè unu ga-enwu ka chi ọbụbọ.+
Unu ga-agbakekwa ngwa ngwa.
Ezi omume unu ga-ebutere unu ụzọ,
Ebube Jehova ana-echebekwa unu n’azụ.+
9 Unu ga-akpọku Jehova, ọ ga-azakwa unu.
Unu ga-arịọ ya ka o nyere unu aka. Ọ ga-asịkwa, ‘M ga-enyere unu aka.’
Ọ bụrụ na unu ewepụ osisi yok e ji echi ndị mmadụ ọnụ n’ala,
Kwụsịkwa ịtụ ndị ọzọ aka* na ịgwa ha okwu ọjọọ,+
10 Ọ bụrụkwa na unu enye ndị agụụ na-agụ ihe na-amasị unu,*+
Nyejuokwa ndị* nọ n’ahụhụ afọ,
Ìhè unu ga na-enwudị n’ọchịchịrị.
Itiri ga-adịkwara unu ka etiti ehihie.+
Ọ ga-emekwa ka unu sie ike.*
Unu ga-adị ka ubi nke mmiri na-ede nke ọma.+
Unu ga-adịkwa ka isi mmiri nke mmiri ya na-anaghị ata ata.
12 Ọ bụ maka unu ka a ga-eji arụghachi ebe ndị e bibiri ebibi n’oge ochie.+
Unu ga-atọghachikwa ntọala ndị e mebiri n’oge ochie.+
A ga-akpọkwa unu ndị na-arụzi ebe e tidara etida ná mgbidi+
Na ndị na-arụzi okporo ụzọ ka ndị mmadụ rụọ ụlọ n’akụkụ ya.
13 Ọ bụrụ na unu ejiri maka Ụbọchị Izu Ike kwụsị* ime ihe masịrị unu* n’ụbọchị m nke dị nsọ,+
Ọ bụrụkwa na unu ewere Ụbọchị Izu Ike ka ụbọchị na-eme unu ezigbo obi ụtọ, ụbọchị Jehova nke dị nsọ, nke unu kwesịrị iji kpọrọ ihe,+
Ọ bụrụkwa na unu ejiri ya kpọrọ ihe kama imewe ihe na-amasị unu na ikwuwe ihe na-enweghị isi,
14 Mụnwa bụ́ Jehova ga-eme ka unu na-enwe ezigbo obi ụtọ,
Meekwa ka unu na-achị n’ebe ndị dị elu n’ụwa.+
M ga-eme ka unu rie ihe si n’ihe Jekọb nna nna unu ketara.+
Ọ bụ Jehova ji ọnụ ya kwuo ihe a.”