-
2 Ndị Eze 10:32, 33Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
-
-
32 Ọ bụ n’oge ahụ ka Jehova gbara nkịtị ka e jiri nwayọọ nwayọọ na-anara ndị Izrel ala ha.* Hazel sikwa ná mpaghara ala ha niile na-alụso ha agha.+ 33 Ọ malitere ná mpaghara ọwụwa anyanwụ Osimiri Jọdan, ya bụ, obodo Gilied niile, ebe ebo Gad, ebo Ruben, na ebo Manase+ bi. Ụfọdụ n’ime obodo ndị ahụ si Aroa, nke dị n’akụkụ Ndagwurugwu Anọn, ruo Gilied na Beshan.+
-