27 N’ihi na ama m nke ọma na unu bụ ndị nnupụisi+ na ndị isi ike.+ Ọ bụrụ na unu na-enupụrụ Jehova isi otú a mgbe m ka nọ ndụ, unu ga-aka enupụ isi ma m nwụọ.
3 M mere ha ihe a n’ihi ihe ọjọọ ndị ha mere, nke kpasuru m iwe. Ha gara na-achụrụ chi ọzọ dị iche iche àjà,+ na-efekwa ha ofufe. Ha amaghị chi ndị ahụ. Unu na nna nna unu hà amaghịkwa ha.+