4 Ma, eze Asiria chọpụtara na Hoshia na-akpara ya nkata. Ọ nụrụ na Hoshia zigara ndị mmadụ na nke Soo eze Ijipt.+ O wetaghịkwaara yanwa bụ́ eze Asiria ụtụ otú ọ na-eweta n’afọ ndị gara aga. N’ihi ya, eze Asiria kere ya agbụ ma kpọchie ya n’ụlọ mkpọrọ.
7 “Mụnwa bụ́ Jehova, bụ́ Chineke Izrel, sịrị, ‘Gakwurunụ eze Juda, onye ziri unu ka unu bịa jụọ m ase, gwakwanụ ya, sị: “Ndị agha Fero, ndị na-abịa inyere unu aka, ga-alaghachi n’obodo ha, bụ́ Ijipt.+