-
2 Ndị Eze 25:4-7Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
-
-
4 Ndị Kaldia mechara kwatuo mgbidi Jeruselem.+ Ka ha gbakwara obodo ahụ gburugburu ịlụso ya agha, ndị agha niile nọ na ya ji abalị si n’ọnụ ụzọ ámá dị n’agbata mgbidi abụọ gbaa ọsọ. Ọnụ ụzọ ámá ahụ dị n’akụkụ ubi eze. Eze gbakwaara tinye isi n’ụzọ gara Araba.+ 5 Ma ndị agha Kaldia chụwara ya, chụkwute ya n’ọzara Jeriko. Ndị agha ya niile hapụkwara ya rie mbọmbọ. 6 Ndị Kaldia jidere ya,+ kpụrụ ya kpụgara eze Babịlọn ebe ọ nọ na Ribla. Ha makwara ya ikpe. 7 Ha gburu ụmụ ya ndị nwoke n’ihu ya. Nebukadneza rụkpọsịkwara Zedekaya anya, tụọ ya ịga abụọ e ji ọla kọpa mee, kpụrụkwa ya laa Babịlọn.+
-
-
Jeremaya 52:7-11Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
-
-
7 Ndị Kaldia mechara kwatuo mgbidi Jeruselem. Ka ha gbakwara obodo ahụ gburugburu ịlụso ya agha, ndị agha niile nọ na ya ji abalị si n’ọnụ ụzọ ámá dị n’agbata mgbidi abụọ gbaa ọsọ. Ọnụ ụzọ ámá ahụ dị n’akụkụ ubi eze. Ha gbakwaara tinye isi n’ụzọ gara Araba.+ 8 Ma ndị agha Kaldia chụwara Zedekaya, chụkwute ya+ n’ọzara Jeriko. Ndị agha ya niile hapụkwara ya rie mbọmbọ. 9 Ndị Kaldia jidere ya, kpụrụ ya kpụgara eze Babịlọn ebe ọ nọ na Ribla nke dị na Hemat. Ọ makwara ya ikpe. 10 Eze Babịlọn nọ na Ribla gbuo ụmụ Zedekaya ndị nwoke n’ihu ya, gbuokwa ndị niile bụ́ ndị isi ndị Juda. 11 Ọ rụkpọsịkwara Zedekaya anya,+ tụọ ya ịga abụọ e ji ọla kọpa mee, kpụrụkwa ya laa Babịlọn ma tụba ya n’ụlọ mkpọrọ. Ọ nọkwa mkpọrọ ruo ụbọchị ọ nwụrụ.
-