-
Jeremaya 25:9Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
-
-
9 m ga-ezi ozi ka a kpọta ezinụlọ niile si n’ebe ugwu.”+ Ọ bụ Jehova kwuru ihe a. O kwukwara, sị, “M ga-agwa Nebukadneza* eze Babịlọn, bụ́ ohu m,+ ka ha bịa lụso obodo a+ na ndị bi na ya na mba ndị a niile gbara ya gburugburu agha.+ M ga-ebibi ha, ha abụrụ ihe na-awụ akpata oyi na ihe a ga-afụrụ mkpọrọhịhị. M ga-ala ha n’iyi. Ha agaghịkwa adịzi.
-
-
Daniel 2:37, 38Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
-
-
37 Eze, ọ bụ gị bụ eze ndị eze, onye Chineke nke eluigwe nyere alaeze a.+ O mere ka ị dị ike, nye gị ume, meekwa ka a na-akwanyere gị ùgwù. 38 O nyefere ndị bi n’ebe dị iche iche n’aka gị, nyefeekwa anụ ọhịa dị iche iche na nnụnụ n’aka gị. O mekwara ka ị na-achị ha niile.+ Ọ bụ gịnwa bụ isi ahụ e ji ọlaedo kpụọ.+
-