-
Jeremaya 27:5-7Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
-
-
5 ‘Ọ bụ mụnwa ji ike m na-enweghị atụ na aka m siri ike kee ụwa, keekwa mmadụ na anụmanụ ndị bi na ya. Enyekwala m ya onye ọ masịrị m inye ya.*+ 6 Ugbu a, enyela m ohu m bụ́ Nebukadneza,+ eze Babịlọn, ala a niile. Enyekwala m ya anụ ọhịa dị iche iche ka ha na-ejere ya ozi. 7 Mba niile ga na-ejere ya na nwa ya na nwa nwa ya ozi ruo mgbe alaeze ya na-agaghịzi adị,+ mgbe ọtụtụ mba na ndị eze ukwu ga-eji ya mere ohu.’+
-