13 N’ihi ya, Ọkaakaa Onyenwe anyị Jehova kwuru, sị: “M ga-eweli aka m mee ndị Ịdọm ihe. M ga-egbu ma mmadụ ma anụ ụlọ. M ga-emekwa ka obodo ha tọgbọrọ nkịtị.+ Malite na Timan ruo Didan, a ga-eji mma agha bibie ha.+
15 Ala Sia bụ́ ugwu ugwu, ya bụ, Ịdọm niile,+ m ga-eme ka ị tọgbọrọ nkịtị otú e mere ka ala ndị Izrel tọgbọrọ nkịtị, ebe ọ bụ na ị chịrị ya ọchị.+ Ị ga-atọgbọrọ chakoo. Ha ga-amarakwa na m bụ Jehova.’”