22 Nna m enyefeela m ihe niile, o nweghịkwa onye ma m* ma e wezụga Nna m.+ O nweghịkwa onye ma Nna m ma e wezụga m na onye ọ bụla m chọrọ ịkụziri gbasara ya.”+
20 Ma anyị ma na Ọkpara Chineke abịala,+ o meekwala ka anyị nwee ikike ịghọta ihe, ka anyị wee mara onye ahụ bụ́ ezigbo onye. Anyị na ezigbo onye ahụ esikwala n’aka Ọkpara ya bụ́ Jizọs Kraịst dị n’otu.+ Ọ bụ onye a bụ ezi Chineke na ndụ ebighị ebi.+