Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • 1 Samuel 21:1-6
    Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
    • 21 Mgbe e mechara, Devid gara Nọb,+ na nke Ahimelek onye nchụàjà. Mgbe Ahimelek hụrụ Devid, ụjọ malitere ịtụ ya, ya asị ya: “Gịnị mere naanị gị ji bịa, n’enweghị onye so gị?”+ 2 Devid asị Ahimelek onye nchụàjà: “O nwere ihe eze gwara m ka m mee. Ma, ọ sịrị m, ‘Ekwela ka onye ọ bụla mara ihe ọ bụla gbasara ozi m na-ezi gị nakwa gbasara ihe m gwara gị mee.’ Mụ na ụmụ okorobịa m kwuru ebe anyị ga-ezute. 3 Ọ bụrụ na i nwere ogbe achịcha ise, nyetụ m ha, ma ọ bụkwanụ gị enye m ihe ọ bụla ọzọ i nwere.” 4 Ma, onye nchụàjà ahụ sịrị Devid: “O nweghị achịcha nkịtị dị ebe a, kama, e nwere achịcha dị nsọ+ m ga-enye gị ma ọ bụrụ na ụmụ okorobịa gị emetụghị ụmụ nwaanyị aka.”*+ 5 Devid asị onye nchụàjà ahụ: “Anyị emetụghị ụmụ nwaanyị aka otú anyị na-anaghị emetụ ha aka ma m gawa agha.+ Ọ bụrụ na ụmụ okorobịa a na-edowe onwe ha nsọ ma anyị na-aga agha nkịtị, ọ̀ bụzi taa ka ha na-agaghị edowe onwe ha nsọ?” 6 Onye nchụàjà ahụ wee nye ya achịcha ahụ dị nsọ,+ n’ihi na e nweghị achịcha ọzọ dị ebe ahụ ma e wezụga ya. Ma, achịcha a adịghịzi n’ihu Jehova n’ihi na e wepụla ya n’ụbọchị a na-eji ewepụ ya, were nke e mere ọhụrụ dochie ya.

Akwukwo Igbo (1984-2025)
Pụọ
Banye
  • Igbo
  • Ziga ya
  • Ịgbanwe Ihe
  • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
  • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
  • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
  • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
  • JW.ORG
  • Banye
Ziga ya