-
Luk 11:29-32Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
-
-
29 Mgbe ìgwè mmadụ ahụ nọ na-ezukọta, ọ malitere ịsị: “Ọgbọ a bụ ọgbọ ọjọọ. Ọ na-achọ ihe àmà. Ma o nweghị ihe àmà a ga-egosi ya ma ọ́ bụghị ọrụ ebube ahụ a rụụrụ Jona.+ 30 N’ihi na otú ahụ ihe mere Jona+ si bụụrụ ndị Ninive ihe àmà, ka Nwa nke mmadụ ga-esi abụrụ ọgbọ a. 31 A ga-akpọlite eze nwaanyị ndịda+ na ọgbọ a n’Ụbọchị Ikpe, ọ ga-amakwa ọgbọ a ikpe, n’ihi na o si na nsọtụ ụwa bịa ịnụ okwu onye amamihe Solomọn na-ekwu. Ma, onye ka Solomọn nọ ebe a.+ 32 Ndị Ninive na ọgbọ a ga-ebili n’Ụbọchị Ikpe. Ndị Ninive ga-amakwa ọgbọ a ikpe, n’ihi na ha chegharịrị mgbe ha nụrụ ihe Jona kwusara.+ Ma, onye ka Jona nọ ebe a.
-