-
Luk 11:24-26Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
-
-
24 “Mgbe mmụọ ọjọọ* si n’ime mmadụ pụọ, ọ na-aga ebe mmiri na-adịghị ka ọ chọta ebe ọ ga-ezu ike. Ọ bụrụ na ọ chọtaghị, ọ na-asị, ‘M ga-alaghachi n’ụlọ m ebe m si pụọ.’+ 25 Mgbe o rukwara, ọ na-ahụ na a zachaala ụlọ ahụ nke ọma, chọọkwa ya mma. 26 Ọ na-agazi kpọrọ mmụọ asaa ọzọ, ndị dị njọ karịa ya. Mgbe ha banyere, ha na-ebiri ebe ahụ. Ọnọdụ ikpeazụ nke onye ahụ na-akazi nke mbụ njọ.”
-