Aịzaya 11:1 Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ 11 Úkwù osisi Jesi+ ga-epu ome.+ Ome+ nke si na mgbọrọgwụ ya pulite ga-amịkwa mkpụrụ. Aịzaya 53:2 Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ 2 Ọ ga-epulite dị ka ome+ n’ihu ya.* Ọ ga-adịkwa ka mgbọrọgwụ nke dị n’ala mmiri na-adịghị. Ọ dịghị ka onye ukwu. Ọ dịghịkwa ebube.+ Mgbe anyị ga-ahụ ya, anyị agaghị ahụ mma pụrụ iche ọ mara nke ga-eme ka anyị bịawa ya nso. Jeremaya 23:5 Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ 5 Jehova kwukwara, sị, “Oge na-abịa mgbe m ga-eme ka e nwee eze, bụ́ onye ezi omume, nke ga-esi n’ezinụlọ* Devid.+ Ọ ga na-achị,+ na-egosi na ọ na-aghọta ihe, na-ekpe ikpe ziri ezi, na-emekwa ezi omume n’ala a.+ Zekaraya 3:8 Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ 8 “‘Joshụa Nnukwu Onye Nchụàjà, biko, nụrụ, gị na ndị nchụàjà nọ ọdụ n’ihu gị, n’ihi na ha bụ ihe àmà. Lee, m na-akpọbata ohu m+ aha ya bụ Ome.+
2 Ọ ga-epulite dị ka ome+ n’ihu ya.* Ọ ga-adịkwa ka mgbọrọgwụ nke dị n’ala mmiri na-adịghị. Ọ dịghị ka onye ukwu. Ọ dịghịkwa ebube.+ Mgbe anyị ga-ahụ ya, anyị agaghị ahụ mma pụrụ iche ọ mara nke ga-eme ka anyị bịawa ya nso.
5 Jehova kwukwara, sị, “Oge na-abịa mgbe m ga-eme ka e nwee eze, bụ́ onye ezi omume, nke ga-esi n’ezinụlọ* Devid.+ Ọ ga na-achị,+ na-egosi na ọ na-aghọta ihe, na-ekpe ikpe ziri ezi, na-emekwa ezi omume n’ala a.+
8 “‘Joshụa Nnukwu Onye Nchụàjà, biko, nụrụ, gị na ndị nchụàjà nọ ọdụ n’ihu gị, n’ihi na ha bụ ihe àmà. Lee, m na-akpọbata ohu m+ aha ya bụ Ome.+