-
2 Pita 1:17, 18Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
-
-
17 N’ihi na Chineke bụ́ Nna mere ka ọ dị ebube, meekwa ka a na-asọpụrụ ya. Chineke, onye ebube na-enweghị atụ na-esi n’aka ya, mere ihe a mgbe o kwuru gbasara ya, sị: “Onye a bụ Ọkpara m, onye m hụrụ n’anya. Ihe ya masịrị m.”+ 18 N’eziokwu, anyị nụrụ olu si n’eluigwe kwuo ihe a mgbe anyị na ya nọ n’ugwu nsọ.
-