-
Luk 12:42-44Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
-
-
42 Onyenwe anyị wee sị: “Ònye n’eziokwu bụ onye ahụ na-elekọta ụlọ, onye kwesịrị ntụkwasị obi, nke nwere uche,* onye nna ya ukwu ga-eme onye na-elekọta ndị na-ejere ya ozi, ka ọ na-enye ha ihe oriri ga-ezuru ha n’oge kwesịrị ekwesị?+ 43 Ohu ahụ ga-enwe obi ụtọ ma ọ bụrụ na nna ya ukwu abịarute wee hụ ya ka ọ na-eme otú ahụ. 44 N’eziokwu, ana m asị unu, ọ ga-eme ya onye na-elekọta ihe niile o nwere.
-