-
Matiu 24:45-47Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
-
-
45 “Ònye n’eziokwu bụ ohu ahụ kwesịrị ntụkwasị obi, onye nwekwara uche,* onye nna ya ukwu mere onye na-elekọta ezinụlọ ya, ka ọ na-enye ha nri ha n’oge kwesịrị ekwesị?+ 46 Ohu ahụ ga-enwe obi ụtọ ma ọ bụrụ na nna ya ukwu abịarute wee hụ ya ka ọ na-eme otú ahụ.+ 47 N’eziokwu, ana m asị unu, ọ ga-eme ya onye na-elekọta ihe niile o nwere.
-