18 “Lee, anyị na-agbago Jeruselem, a ga-enyefekwa Nwa nke mmadụ n’aka ndị isi nchụàjà na ndị odeakwụkwọ n’ebe ahụ. Ha ga-amakwa ya ikpe ọnwụ.+ 19 Ha ga-enyefekwa ya n’aka ndị mba ọzọ ka ha were ya mee ihe ọchị, pịakwa ya ihe ma kpọgide ya n’osisi.+ N’ụbọchị nke atọ, a ga-akpọlite ya.”+