-
Mak 14:17-21Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
-
-
17 Ná mgbede, ya na ndịozi ya iri na abụọ ahụ bịara.+ 18 Mgbe ha nọ na-eri ihe na tebụl, Jizọs sịrị: “N’eziokwu, ana m asị unu na otu onye n’ime unu, onye mụ na ya na-erikọ nri, ga-arara m nye.”+ 19 Ọ malitere iwute ha, ha ana-agwa ya n’otu n’otu, sị: “Ọ bụghị m, ka ọ̀ bụ m?” 20 Ọ sịrị ha: “Ọ bụ otu onye n’ime unu iri na abụọ, onye mụ na ya na-esurukọ achịcha n’efere.+ 21 N’ihi na Nwa nke mmadụ na-ahapụ unu, otú e dere banyere ya. Ma, onye ga-arara Nwa nke mmadụ nye ga-ata ahụhụ.+ Ọ gaara akara onye ahụ mma ma a sị na a mụghị ya amụ.”+
-